Maika 6 - Igbo Contemporary Bible 2020

Ikpe Onyenwe anyị

megide Izrel

1Geenụ ntị nʼihe Onyenwe anyị na-ekwu,

“Bilienụ ọtọ, ma kwuonụ nʼihu ugwu niile ụzọ m siri mejọọ unu.

Ka ugwu nta niile nụkwa ihe i nwere ikwu.

2“Ma ugbu a geenụ ntị, unu ugwu niile,

geenụ ntị, unu ntọala ebighị ebi niile nke ụwa,

nʼihi na Onyenwe anyị nwere ikpe megide ndị nke ya.

Ọ bụkwa Izrel ka ọ ga-arụso ụka.

3“Unu bụ ndị m, gịnị ka m mere unu?

Gwanụ m ụzọ m si boo unu ibu arọ? Zaanụ m.

4Nʼihi na e si m nʼala Ijipt kpọpụta unu.

Agbapụtara m unu site na ịbụ ohu,

nye unu Mosis

na Erọn na Miriam ka ha nyere unu aka.

5Ndị m, chetanụ

ihe Balak eze Moab zubere

na ihe Belam nwa Beoa zara ya.

Chetanụ njem unu site nʼobodo Shitim ruo obodo Gilgal,

ka unu hụ nzọpụta nke Onyenwe anyị.”

6Gịnị ka m ga-eji bịa nʼihu Onyenwe anyị,

ịkpọ isiala nʼihu Chineke onye dị oke elu?

M ga-eji onyinye aja nsure ọkụ bịa nʼihu ya

nke e ji ụmụ ehi gbara otu afọ chụọ?

7Ọ ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ, bụ ọtụtụ puku ebule,

ya na iri puku mmanụ na-asọ dịka iyi?

Aga m eji nwa mbụ m chụọ aja njehie m,

maọbụ mkpụrụ nke ahụ m chụọ aja maka mmehie nke mkpụrụobi m?

8Nʼihi na o gosila gị, gị mmadụ, ihe dị mma.

Gịnịkwa bụ ihe ahụ Onyenwe anyị na-achọ nʼaka gị,

Ọ bụ na ọ bụghị ikpe ziri ezi, na ịhụ ime ebere nʼanya,

na iji obi dị umeala soro Chineke gị na-eje ije?

Ahụhụ Izrel na ikpe ọmụma ya

9Gee ntị! Olu Onyenwe anyị na-ada na-akpọku ndị obodo ahụ,

nʼezie, ịtụ egwu gị bụ inwe amamihe.

“Nụrụnụ olu mkpanaka na Onye hiwere ya.

10Ọ ga-abụ na m ga-echezọ akụ ị kpara nʼụzọ na-ezighị ezi, gị ụlọ ajọ omume,

ya na ihe ọtụtụ nke na-erughị eru unu ji ere ahịa, bụ nke abụrụ ọnụ?

11M ga-asị onye na-eji ihe ọtụtụ aghụghọ azụ ahịa,

na onye bu akpa nke ihe ọtụtụ aghụghọ dị iche iche juru nʼime ya na aka ya dị ọcha?

12Ndị ọgaranya unu bụ ndị na-eme ihe ike,

ndị mmadụ nọ nʼime gị na-agha ụgha,

ire ha na-ekwu naanị okwu aghụghọ.

13Nʼihi ya, ebidola m ịla unu nʼiyi,

na ime ka unu bụrụ ndị e bibiri nʼihi mmehie unu

14Unu ga-eri nri ma afọ agaghị eju unu;

afọ agaghị ejukwa unu eju.

Unu ga-ewezuga ihe, ma unu agaghị echekwa ha,

nʼihi na ihe ọbụla unu nwere ike chekwaa, ka m ga-ewere nyefee nʼaka mma agha.

15Unu ga-akụ mkpụrụ, ma unu agaghị ewe ihe ubi,

unu ga-azọchapụta mmanụ oliv, ma unu agaghị ete ya nʼahụ unu;

unu ga-azọchapụtakwa mmanya site na mkpụrụ vaịnị, ma unu agaghị aṅụ mmanya ya.

16Unu edebela ụkpụrụ niile bụ nke Omri,

na omenaala niile nke ụlọ Ehab,

unu gbasokwara ndụmọdụ ha niile.

Nʼihi ya, aga m enyefe unu nʼaka mbibi

mee ka ndị gị ghọọkwa ihe ọchị,

unu ga-aghọkwara mba niile ihe nkọcha.”

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help